Sale!
Placeholder

ADỊMIRE NGWA NKỤZI KỌMPUTA NA MMETA NKE ỌMA ỤMỤAKWỤKWỌ N’AGỤMAGỤ IGBO N’ỤLỌAKWỤKWỌ SINỊỌ SEKỌNDỊRỊ NA ZONU MMỤTA ISHIELU NA STEETI EBONYI

10,000 3,000

Topic Description

All listed  project topics on our website are complete work from chapter 1-5 in Typed format ( PDF/MS word format ) which are well supervised and approved by lecturers who are intellectual in their various fields of discipline, documented to assist you with complete, quality and well organized researched material. which should be use as reference or Guild line...  See frequently asked questions and answeres


ISI NKE MBỤ

MKPỌLITE

Ntọala Nchọcha

Asụsụ bụ ụzọ mmadụ na ibe ya si enwe mmekọrịta, ma bụrụkwa ihe dị mkpa na ndụ mmadụ. Anozie (1999) kọwara asụsụ dị ka ụda sitere n’olu mmadụ nwere nghọta mgbe ọgan okwu dị iche iche megharịrị ahụ n’ụzọ dị iche iche a haziri ahazi n’ụdị ọdị mara nke na-abụghị ebumpụta ụwa site n’okwu ọnụ maọbụ n’edemede. Na asụsụ abụghị ebumpụta ụwa na-egosi na mmadụ malitere sụwa asụsụ maka mkpa dapụtara ka Chukwu kechara ụwa ka mmadụ na ibe ya nwee ike ịkpakọrịta ụka.

Onye ọbụla biliri ọtọ nwere ebe ọ na-aga. Otu ihe onye ọbụla hụrụ asụsụ Igbo n’anya na-agba mbọ eme bụ ka ọ hụ na asụsụ Igbo anwụghị anwụ. N’otu aka ahụ, asụsụ Igbo bụ asụsụ ndị Igbo na-asụ nke ha ji enwe mmekọrịta n’etiti onwe ha. Ọ bụ asụsụ e ji mara ndị Igbo. N’ezie, asụsụ Igbo bụ Igbo n’onwe ya n’ihi na ọ bụ asụsụ e mebere maka ndị Naịjirịa bi na ndịda anyanwụ ka ha were na-enwe  mmekọrịta n’etiti onwe ha. Dịka asụsụ mba ụwa ọzọ siri nwee ọrụ dị iche iche ha na-arụ, asụsụ Igbo nwekwaziri ọrụ dị iche ọ na-arụ nke gụnyere: asụsụ ka e ji akọwa onwe, ọ bụ ihe mmadụ na ibe ya ji enwe mmekọrịta, asụsụ na-akọwapụta ebumnuche mmadụ, nghọta ya na otu amamihe ya ha. Na-aka nke ọzọ, asụsụ Igbo bakwaziri ọtụtụ uru n’ihi na ọ bụ asụsụ Igbo ka onye Igbo ji ekele onye Igbo ibe ya, ọ bụrụ na o nwere onye Igbo chọrọ izipụta aṅụrị maọbụ iwe dị ya n’obi, asụsụ Igbo ka o ji eme ya. Asụsụ Igbo bụ naanị otu ihe na-egosipụta na ndị Igbo bụ otu ma bụrụkwara nwanne ọkachasị n’usoro ebimndụ, okpukperechi tụmadị na-ebe omenala ha dị. Mmadụ ọbụla Chukwu kere n’ụwa a nwere asụsụ ọ na-asụ. Ya bụ na njirimara ndị Igbo bụ asụsụ Igbo. Asụsụ nwekwaziri nghọta zuru oke n’ihi na onye ọbụla abụghị onye Igbo a kụziere ya ga-aghọta ya ma ghọta usoro odide ya na iwu ya dị iche iche. Obodo ọbụla enweghị asụsụ dị ka obodo abụrụ ọnụ n’ihi na ọ bụ asụsụ ka e ji ezipụta omenala. Asụsụ Igbo bụ ndụ ndị Igbo n’ihi na ọ bụ ya na-egosipụta ndị ha bụ, ebe ha si na usoro obibi ndụ ha.

Dịka nchọcha a ga-agbado ụkwụ n’adịmire ngwa nkuzi kọmputa na mmeta nke ọma ụmụakwụkwọ n’agụmagụ Igbo n’ụlọakwụkwọ sinịọ sekọndịrị na zonu mmụta Ishielu na steeti Ebonyi, ọ bụ ihe kwesịrị ekwesị ịkọwapụta na ọ bụ asụsụ ka e ji ezipụta agụmagụ. Agụmagụ Igbo enweghị ike ịkwụrụ onwe ya ma e wezuga asụsụ e ji ezipụta ya.

Dịka Nwadike (1992) siri kọwaa n’agụmagụ malitere oge ndị Igbo malitere ndụ ha. Ọ bụ ọrụ nka nke sitere n’echiche pụta ma bụrụ nke e si na ya egosipụta ma na-ahụ ndụ, ebimndụ, na akparamaagwa nke e ji asụsụ pụrụ iche wee bipụta maọbụ depụta. Nwadike kọwara agụmagụ dị ka ihe ọmụmụ bụ ọrụ nka nke sitere n’echiche pụta ma bụrụ nke e si na ya egosipụta ma na-ahụ ndụ. O kwuru na agụmagụ ọbụla ga-enwerịrị isiokwu, obere isiokwu, ntọala, ọnọdụ na nkamma agụmagụ nke gụnyere ejije, abụ na iduuazị. Mbah na Mbah (2007) kọwara agụmagụ dị ka ihe niile e dere ede n’akwụkwọ. Ha gara n’ihu kọwaa na ụzọ ọzọ e si akọwa agụmagụ bụ ide maọbụ itule akwụkwọ. Ha kwukwara na ụzọ ọzọ e si akọwa agụmagụ bụ ikwu na ọ bụ nnukwu akwụkwọ ọgụgụ nke e ji nka wee kwupụta n’agbanyeghị ihe e dere na ya.

Agụmagụ bara ọtụtụ uru nke mere ndị mmadụ ji enwe mmasị n’ide maọbụ ịgụ ya. Dika Nwadike (1992) kọwapụtara uru agụmagụ bara nke gụnyere: ịkpa obi ọma n’ebe onye na-agụ, na-ege ntị maọbụ na-ele ya nọ. Inye aka ịmata etu mba dị iche iche siri hụ ụwa na ka ha si ebi ndụ. Inye aka iwepụ ihere n’anya ndị mmadụ. Inye aka ịmata etu e si e ji atụmatụokwu dị iche iche dị ka: mbụrụ, myiri, mmemmadụ, egbeokwu, ahaọnọchi, nsinụụda, bịam bịam mgbochiume na bịam bịam ụdaume, nkwuma, ntakwu, nhagideokwu, ilu, ụkabụilu, akpaalaokwu na atụmatụokwu ndị ọzọ dị iche iche. Ọmụmaatụ ndị a emela agụmagụ ịkwụpụta dị ka enyo e ji ele ndụ mmadụ n’ụzọ pụrụ iche ezipụta agụmagụ.

Nchọcha a agaghị ezu oke ma ọ bụrụ na onye nchọcha akọwapụtaghị nkenụụdị agụmagụ Igbo dịka o siri metụta isiokwu nchọcha a. N’ihi ya, e kere agụmagụ Igbo ụzọ abụọ gbara ọkpụrụkpụ. Ha gụnyere ndị a: agụmagụ ọdịnala na agụmagụ ugbua maọbụ agụmagụ ederede. Nkenụụdị ndị a nwekwaziri mgbọrọgwụ dị iche iche. Agụmagụ ọdịnala nwere alaka atọ nke gụnyere: Abụ, Ejije na Akụkọ. N’otu aka ahụ, agụmagụ ugbua nwekwaziri alaka atọ nke gụnyere: Abụ, Ejije na Iduuazi. Nchọcha a ga-eleba anya na nkenụụdị agụmagụ abụọ ndị a onye nchọcha depụtagoro.

Agụmagụ ọdịnala dị ka aha ya siri dị bụ ọrụ nka nke a na-ekwu n’ọnụ. Ọ bụ agụmagụ e nwekọtara ọnụ, o nweghị onye ọ bụ nke ya kpọmkwem, o nweghi onye ma afọ ọ malitere n’ihi na e detughi ya n’akwụkwọ. Ọ bụ agụmagụ Igbo dị ọkpụtọrọkpụ nke si n’aka fere aka wee ruo aka. Agụmagụ ọdịnala bụ agụmagụ mbụ ndị Igbo jiri malite agụmagụ. Agụmagụ ugbua sitere n’agụmagụ ọdịnala wee tolite. Ọ bụ ihe nwa na-etote, o tokwuru. Njirimara agụmagụ ọdịnala gụnyere: a na-emekarị ya n’obom, agụmagụ ọdịnala na-agbanwe agbanwe, ọ na-agbanwe mgbe o siri n’otu aka fere aka ọzọ, ihe niile a na-eme n’agụmagụ ọdịnala na-apụta ihe; a na-ahụ ha n’anya maọbụ nụ ha na ntị dịka ahụ onye nka, olu ya nakwa ọchị ya na mkpu ọ na-eti dgz. E nwekọtara agụmagụ ọdịnala ọnụ, a naghị ama onye wepụtara ya. Agụmagụ ọdịnala dịka aha ya siri dị na-agbakwasa ụkwụ n’ihe ọdịnala. A na-e jikarị ngwa e jiji ọdịnala emepụta ya n’obom.

Site na nchọcha Nwadike na Okebalama merela banyere agụmagụ ọdịnala, ha chọpụtara na agụmagụ ọdịnala bara ọtụtụ uru na nkụzi nakwa ọmụmụ agụmagụ Igbo nke ga-enyere ụmụakwụkwọ aka n’ọmụmụ ha. Ụfọdụ uru ndị a gụnyere: Ndị Igbo ji agụmagụ ọdịnala anọrị oge ọkachasị n’oge gboo mgbe redio, tiivi, sịnịma na kọmputa apụtabeghị. Ndị Igbo ji agụmagụ ọdịnala akụziri ụmụ ha ihe n’ụzọ dị iche iche, akụkọ ifo dị iche iche na-akụzi ezigbo agwa na akparamaagwa; gwamgwamgwam na anụcha ụbụrụ ụmụakwụkwọ. Agụmagụ ọdịnala na-akwalite omenaala n’ihi na mgbe ọbụla a na-ezipụta ya n’ụdị ekwurunọọnụ, ọkachasị n’ụdị akụkọ ifo tụmadị akụkọ okike, ụmụaka na-esi na ya amụta omenala ha. Ha na-esikwa na ya amata ihe ndị obodo ha na-agbarụrụ ihu. Ọ na-eme ka ụmụaka gbasie ike n’imegharị ahụ.Ọ na-ewepu mmadụ ihere n’ihu oge ọ bụ dịmkpa. Ọ bụkwa ezigbo ngwa ọrụ maka agụmagụ ederede. A na-esi na ya egosipụta usoro ebimndụ na nsirihụụwa ndị Igbo.

N’iga n’ihu, Obidiebube (2011) kọwara agụmagụ ugbu a dịka agụmagụ e depụtara n’akwụkwọ. Ọ bụ echiche odee ji ekereuche ya chepụta, hazie ma werekwa asụsụ nka depụta. Agụmagụ ugbu a na agbakwasa ụkwụ n’usoro ebimndụ na nsirihụụwa ọha obodo maọbụ agbụrụ. E kere agụmagụ ugbu a ụzọ atọ gbara ọkpụrụkpụ nke gụnyere iduuazị, abụ na ejije. Ụfọdụ njirimara agụmagụ ugbu a bụ na naanị n’elu nkwago ka a na-emepụta ya, adịghị ọtụtụ wee nwere ya. Agụmagụ ederede nwere oge o bidoro. Ọ naghị anwụ anwụ n’ihi na e deturu ya n’akwụkwọ.

Ngwa nkụzi bụ ngwa ọrụ dị iche iche onye nkụzi na-ewebata na nkụzi ya ka o wee doo anya. Iji wee kwado nke a, Nwadike (1993) kọwara ngwa nkuzi dịka ihe ndị ahụ onye nkuzi na-ewebata na nkụzi iji nyere nkụzi aka n’ime ka ụmụaka ghọta ihe onye nkuzi na-akụzi. Onye ọrụ ọbụla nwere ngwa ọrụ ya. Onye ọrụ ubi nwere mma, ọgụ, mbazụ, abọ na ekete iji mee ka ọrụ ya na-aga nke ọma. N’otu aka ahụ, onye nkụzi nwere ngwa nkụzi o ji akụzi nkụzi iji mee ka nkụzi ya ruo ala. Onye nkụzi na-ekwu okwukwu okwukwu abụghị ezi onye nkụzi.

E kere ngwa nkụzi ụzọ abụọ nke gụnyere: ngwa nkụzi ọdịnala na ngwa nkụzi ọlọrọọhụrụ. Ngwa nkụzi ọdịnala bụ ngwa nkụzi mgbe ochie ndị nkụzi ji akụzi ihe tupu ndị nchọcha ewepụta ngwa nkụzi ọlọrọọhụrụ. Ha gụnyere ndị a: Ngwa eserese, nkọwa ọnụ nkịtị, ngwa sitere n’ihe nkịtị, iji ụgbọojii na nkụzi dgz. Ngwa nkụzi ọdịnala ụfọdụ dịkwa mkpa n’ọnọdụ agụmaakwụkwọ taa n’ihi na isiokwu metụtara ọdịnala ka ndị nkụzi ji ya akụzi.

Ngwa nkụzi ọlọrọọhụrụ dịka aha ya siri dị bụ ngwa nkụzi nke na-enyere ndị nkụzi aka na nkụzi ha ka echiche dị n’isiokwu ha na-akụzi wee pụta ma bụrụ nke ga-edo ụmụakwụkwọ e mebeere ya anya. Ọ bụ ngwa nkụzi ọlọrọọhụrụ n’ihi na ụzọ arụmọrụ ya gbara ụmụ mmadụ gharịị. Ebe echiche ụmụakwụkwọ dizi bụ na ngwa nkụzi ọlọrọọhụrụ. Mgbanwe ndị a sokwa kpalie mụọ onye nchọcha ịchọputa ihe butere mgbanwe a nakwa adịmire mgbanwe ndị a na nkụzi na ọmụmụ agụmagụ Igbo site n’iji ngwa nkụzi kọmputa. Ọmụmaatụ ngwa nkụzi ọlọrọọhụrụ gụnyere: Igwe ome ka mmadụ, Igwe Onyonyo, kọmputa, Redio, Tiivi, Rollegrafụ, Teepu Rekọda, dgz.

Ngwa nkụzi bara ọtụtụ uru n’ebe ụmụakwụkwọ nọ. Ụfọdụ uru ndị a gụnyere: Ọ na-enyere onye nkụzi aka na nkụzi ya site n’ime ka ụmụaka ghọta ihe a na-akụzi. Nke abụọ, ọ na-ebelatara onye nkụzi oke nkọwa na ọmụmaatụ. Ọzọkwa, ọ na-ejide ụmụakwụkwọ nọ na klaasị, echiche ha adị n’ihe a na-akụzi. Nke anọ, mgbe onye nkụzi na-anọghi ya, ọ na-ejide ndị klaasị, ha enwee ihe omume, ọ na-eme ka ụmụaka nwee mmasị n’ihe ọmụmụ ha. Ngwa nkụzi na-eme ka ekereuche ụmụakwụkwọ pụta ihe. Ọ na-emekwa ka asọmpi dị n’etiti ụmụakwụkwọ.

Ngwa nkụzi kọmputa dị ka ngwa nkụzi onye nchọcha ga-eji mee nchọcha a bara ọtụtụ uru nye ụmụakwụkwọ. Uru ndị a mere Adegun (2007) ji kọwaa ngwa nkụzi kọmputa dịka igwe ga-eme ka nkụzi na ọmụmụ dị ire n’ọnọdụ agụmakwụkwọ. Ọ bụ ụzọ dị iche iche nkụzi na ọmụmụ si enwe adịmire nke ga-enyere ụmụakwụkwọ aka n’ọmụmụ ha ma mee ka ha nwee ezi mmasị banyere isiokwu onye nkụzi na-akụziri ha. Abimbade (2006) hụtara kọmputa dị ka ụzọ maọbụ ọnọdụ agbamonwe nke dị n’etiti mmadụ abụọ maọbụ karịa bụ nke ga-eme ka mmekọrịta dị ire ma nwee nghọta na mpụtara zuru oke. Abịmbade gara n’ihu wee kwuo na ihe ga-ebute adịmire na mmekọrịta mmadụ n’ibe ya bụ ma e nwere ezi nzaghachi nke ga-egosi na nkụzi na ọmụmụ tụmadụ mmekọrịta weere ọnọdụ ya dịka o siri kwesi.

N’ọnọdụ mba ụwa taa, ngwa nkụzi kọmputa bụ ngwa nke mba ụwa dị iche iche na-asọpụrụ n’ihi na ụzọ arụmọrụ ya gbara ụmụ ụwa gharị. Ya mere Ọnwụmere (2008) jiri kwuo na kọmputa bụ ụzọ e si eweta, edokọ ma na-emepụta ihe ọmụmụ dị iche iche ka mmụta ya wee doo onye ọbụla anya. Ọ na-eme ka mmụta dịgịde.

Uru ngwa nkụzi kọmputa bara na nkụzi na ọmụmụ agụmagụ Igbo dị ọtụtụ nke gụnyere: ọ na-eme ka nkụzi dị mfe, ọ na-enyere onye nkụzi aka ịchọpụta ebe ụmụakwụkwọ na-eme ọfụma na ebe ha na-eri mperi. Nke a na-apụta ihe site n’ikewasị ha ma tinyere ha ihe ha ga-amụ. Ọ ga-eme ka ụmụakwụkwọ mata na ha ga-aza ajụjụ na ngwụcha ihe ọmụmụ ha. Nke a pụtara na nkụzi nwere ike ịga n’ihu ma ọ bụrụ na onye nkụzi anọghị ya. Nke a ga-eme ka nghọta ha dị ire, ọgụgụ isi ha ga-abawanyekwa. Ngwa nkụzi kọmputa ga-eme ka ụmụakwụkwọ mụta abụ ọnụ Igbo ọkachasi abụ ndị Igbo na-e jighi egwu egwu dịka: abụ otito, abụ agha, abụ ngụgọ, abụ akwa, abụ ikpe, abụ nkọcha dgz. Nke a ga-adị ire ma ọ bụrụ na onye nkụzi eburu ngwa nkụzi kọmputa gaa n’ebe a na-emepụta ụmụ abụ ndị a ma tinye ha na ngwa nkụzi kọmputa dịka akụrụngwa mmụta. Ọ ga-eme ka ụmụakwụkwọ nwee ezi mmasị n’ebe agụmagụ dị.

Nchọcha a ga-elebakwa anya na jenda bụ nke na-egosi abụm nwoke maọbụ nwaanyị. N’ala Igbo, jenda bụ ọnọdụ abụm nwoke na nwaanyị. Na zonu mmụta Ishielu, e nwere ụlọakwụkwọ ndị nwoke na ndị nwaanyị na-agụkọ akwụkwọ ọnụ. Ụmụakwụkwọ ndịa nọ na-agbata afọ iri na anọ, tụmadị afọ iri na ise (14 & 15 years). Nchọcha ndị ọkammụta megoro na-ezipụta na ụmụnwaanyị ka ndị nke nwoke emeta nke ọma na-ebe agụmagụ Igbo dị n’ala Igbo. Bassow (1991) kọwara jenda dịka ọrụ maọbụ omume a na-atụ anya n’aka mmadụ n’ihi na a mụrụ onye ahụ ọ bụrụ nwoke ma ọ bụ nwaanyị. Keller n’ime Azikiwe (2005), n’echiche nke ya, kọwara na jenda bụ ihe obodo mepụtara ha ji egosi ndiịche dị n’etiti ọrụ, omume, echiche na mmetụta nke ndị nwoke na nke ndị nwaanyị. Nke a pụtara na ọ bụ obodo na-ekpebi ọrụ na omume a na-atụ anya ya n’aka ndị bụ nwoke nakwa ndị bụ nwaanyị. Site na nkọwa ndị a ndị nchọcha nyerela, onye nchọcha ga-elebazi anya na mmeta nke ọma ndị nwoke na ndị nwaanyị na nkụzi na ọmụmụ agụmagụ Igbo.

Nchọcha a ga-elebakwa anya n’ebe a rụnyere ụlọakwụkwọ. Gburugburu ebe a rụnyere ụlọakwụkwọ bụ ebe ụmụakwụkwọ na-agụ akwụkwọ. Gburugburu ndị a na-enwe ihe mmetụta n’ọnọdụ nkụzi na ọmụmụ. Ụfọdụ ụloakwụkwọ sinịọ sekọndịrị dị na zonu mmụta Ishielu ka a rụnyere n’obodo mepere emepe, ebe ụfọdụ ka a rụnyere n’ime obodo. Ụlọakwụkwọ ndị a niile nọ n’okpuru ọchịchị zonu mmụta Ishielu na steeti Ebonyị.

Umo (2001) kọwapụtara na ebe a rụnyere ụlọakwụkwọ na-emetụta ụmụakwụkwọ. Site na nkọwa Umo, ụmụakwụkwọ ndị nọ n’obodo mepere emepe na-emeta nke ọma karịa ndị nọ n’ime obodo n’ihi na ha na-enwe ọtụtụ ndị nkụzi mara ihe ha na-akụzi. Ha na-enwekwa ọtụtụ ngwa nkụzi ga-enyere ha aka na mmụta.

Ihe kpaliri mụọ onye nchọcha ịhọrọ isiokwu a bụ ndaghachi azụ agụmagụ Igbo na emetaghị nke ọma ụmụakwụkwọ sinịọ sekọndịrị na zonu mmụta Ishielu na steeti Ebonyi n’ebe agụmagụ Igbo dị. Site na rịpọt nke onye isi ule na-ahụ maka ule West African Senior School Certificate Examination (WASSCE) depụtara n’afọ puku abụọ na iri na anọ (2014). Onye isi ule (WASSCE) depụtara na ụmụakwụkwọ ndị sinịọ sekọndịrị na zonu mmụta Ishielu anaghị emeta nke ọma n’ebe agụmagụ Igbo dị n’ule “West African Senior School Certificate Examination”. Zonu mmụta Ishielu bụ otu n’ime zonu mmụta e nwere na steeti Ebonyi. Zonu a nwekwaziri ogbe ndị mepere emepe na ndị nke nọ n’ime obodo na ya. Asụsụ ndị nọ n’ogbe abụọ ndịa abụghị otu. Ụfọdụ ndị nọ n’ogbe ndịa n’asụ asụsụ Igbo kpọmkwem, ebe ụfọdụ n’ime ha anaghị asụ ọkachasị ndị Okpoto, Amụụda. Ndịiche ndịa sokwazi ebute ndaghachi azụ na-emetaghị nke ọma ndịa n’ebe nkụzi na ọmụmụ agụmagụ Igbo dị. Ndaghachi azụ ndị a bụ ihe kpaliri mụọ onye nchọcha ịhọrọ isiokwu ya bụ “adịmire ngwa nkụzi kọmputa na mmeta nke ọma ụmụakwụkwọ n’agụmagụ Igbo n’ụlọakwụkwọ sinịọ sekọndịrị na zonu mmụta Ishielu n’Ebonyi steeti”. Isiokwu a mere onye nchọcha jiri chọọ ileba anya n’adịmire ngwa nkụzi kọmputa na nkụzi agụmagụ Igbo nakwa mmeta nke ọma ụmụakwụkwọ site n’iji ngwa nkụzi kọmputa kụziere ụmụakwụkwọ agụmagụ Igbo.

Mgbamonwe ndị onye nchọcha na-ele anya na nchọcha a bụ na ndị nne na nna adịghizi nkwadebe ikuziri ụmụ ha agụmagụ Igbo nke gụnyere agụmagụ ọdịnala na agụmagụ ugbu a. Ụfọdụ ndị nne na nna echefuola na ihe ha kụziri ụmụaka ha ka ha ga-eji wee too. Ọ bụ ihe mwute na ndị nne na nna chọrọ ka njirimara ndị Igbo nwụọ ma chefuo na o nweghi onye ọ ga-abụ a napụ ya nke ya, obi a na-atọ ya ụtọ. Ụfọdụ ndị nne na nna chefuru na ọ bụ mkpụrụ ha kụnyere nakwa ntọala ha tọọrọ ụmụ ha mgbe ha na-eto eto banyere agụmagụ Igbo ka ha ga-eji wee tolite.

Mgbamonwe ọzọ onye nchọcha na-ele anya na nchọcha a bụ na ndị nkụzi agụmagụ Igbo ahapụla ọrụ dịịrị ha site n’ịhapụ nakwa ịgbaziri ụmụakwụkwọ ndị na-amụ agụmagụ Igbo mgbe ha na-ejehie ụzọ banyere omume ha n’ebe agụmagụ Igbo nọ. Ndị nkụzi agụmagụ Igbo echefuola na ha bụ enyo ụmụakwụkwọ ji ahụ ụzọ.

Mgbamonwe ọzọ bụ na ndị ụlọ ọrụ na-ahụ maka mmụta ya na ndị na-ahazi kurikulum mmụta emenyụọla ọkụ ịkwalite agụmagụ Igbo. Ha kwadoro ọnọdụ a site n’iwepu asụsụ na agụmagụ Igbo na kurikulum mmụta. Agụmagụ Igbo abụghịziri ndị nọ n’ụlọakwụkwọ sinịọ sekọndịrị iwu nke na ọ bụghịzi ha niile na-ede ya n’ule WAEC. Ọnọdụ a nyeziri ndị na-enwebughị mmasị n’ebe agụmagụ Igbo dị ka ha gbaghapụ ya kpam kpam. O nweghizikwa ntaramahụhụ ha mebeere nwa afọ Igbo ọbụla na-enweghị mmasị n’ebe agụmagụ Igbo nọ ga-ata.

N’ihi ndaghachi azụ ndị a nakwa mgbamonwe ndị a mere onye nchọcha jiri sị na ọ dị mkpa ka ndị Igbo chelaa echiche azụ. Agụmagụ Igbo so n’ihe na-ewepụta n’uju ka ndụ na obibi obodo siri dị. Agụmagụ Igbo so n’ihe na-ewepụta n’uju ka ndụ na omenaala siri dị tụmadị usoro okpukpere chi ndị Igbo siri malite. N’ihi nke a ka onye nchọcha jiri chọọ ịmata adịmire ngwa nkụzi kọmpụta n’agụmagụ Igbo. Onye nchọcha chọkwara ịmata otu ngwa nkụzi a ga-elebakwa anya na mmeta nke ọma ụmụakwụkwọ ndị nwoke na ndị nwaanyi tụmadị mmeta nke ọma ndi e ji ngwa nkụzi kọmputa kụziere agụmagụ Igbo na ndị e jighi. Onye nchọcha ga-eleba anya ma ọ bụ e jighi ezi ngwa nkụzi kụzie agụmagụ Igbo na-ebute emeghị nke ọma ụmụakwụkwọ n’ịmụ agụmagụ Igbo.

Nsogbu Nchọcha

Nkụzi asụsụ Igbo kemgbe e mere ka ọ bụrụ ihe a na-akụzi n’ụlọakwụkwọ ka na-aga n’ihu na-enwe nsogbu dị iche iche nke na-egbochi mmeta nke ọma ụmụakwụkwọ n’ihe ọmụmụ agụmagụ Igbo, bụ nke bụ otu n’ime mpaghara ihe ọmụmụ e nwere n’asụsụ Igbo a na-amụ n’ụlọakwụkwọ sinịọ sekọndịrị. Agụmagụ n’asụsụ Igbo ka bụ ihe ụmụakwụkwọ anaghị emeta nke ọma na ya etu o kwesịrị n’ule dịka onye isi ule n’otu kọmiti na-ahụ maka WASSCE (2014) kọwara. Ọnọdụ dị otu a bụ nke na-adịghị mma ma bụrụ nke na-ekwesịghị ịdị n’ebe ụmụ Igbo nọ. Ọ bụ ihe mwute na ọtụtụ ụmụ Igbo na-eleda asụsụ Igbo anya, na-agbanyeghị agbambọ niile ndị gọọmenti etiti nke Naịjirịa na-agba maka ịkwalite ọmụmụ na nkụzi asụsụ Igbo nke ga-enye aka na nkụzi na ọmụmụ agụmagụ Igbo.

Ihe ọnọdụ a jiri jọọ njọ bụ na ọtụtụ ndị nne na nna anaghị akwado ụmụ ha ka ha gụọ ihe banyere asụsụ Igbo. Eleghị anya, ọ bụrụ ihe sitere n’aka ụmụakwụkwọ ndị a n’onwe ha dịka onye isi ule WASSCE (2014) siri kọwaa na e metaghị nke ọma ụmụakwụkwọ n’ule agụmagụ Igbo nwere ike bụrụ n’ihi e jighi asụsụ Igbo kpọrọ ihe. Ndị kọmiti a gakwara n’ihu kwuo na ụmụakwụkwọ anaghị etinye uchu n’ihe gbasara ọmụmụ agụmagụ Igbo. Nke a mere na mgbe ha na-aza ajụjụ agụmagụ Igbo n’ule, ọ na-abụ ihe isi ike dịrị ha n’ihi etinyeghị uchu na ya bụ ọmụmụ. Ụfọdụ ụmụakwụkwọ kwenyere na o nweghị uru asụsụ Igbo bara, nakwa enweghi ebe asụsụ Igbo ga-eduje ha. Ọ dị mkpa ime ka ụmụakwụkwọ ndị a mata uru na mkpa ọ dị ịmụ asụsụ Igbo nakwa ọghọm na ọdachi ga-adị n’ọdịnihu ma ọ bụrụ na asụsụ na agụmagụ nwụọ n’aka ha.

N’eziokwu, ọtụtụ nsogbu ka ụmụakwụkwọ sinịọ sekọndịrị na-agabiga n’ọmụmụ agụmagụ Igbo ọkachasị ndị nke nọ na zonu mmụta Ishielu na steeti Ebonyi. Otu n’ime nsogbu ndị a nwere ike bụrụ e jighi ezigbo ngwa nkụzi dịka kọmputa akụzi agụmagụ. Atuleela adịmire ngwa nkụzi kọmputa n’ihe ọmụmụ ndị ọzọ dịka ihe ọmụmụ sayensi asụsụ mana adịmire ya bụ ihe atụlebeghị n’ihe ọmụmụ asụsụ Igbo ọkachasị n’agụmagụ Igbo ma bụrụ nke onye nchọcha chọrọ ileba anya. Ọ bụ ya mere onye nchọcha ji wee chọọ ịchọpụta adịmire ngwa nkụzi kọmputa na mmeta nke ọma ụmụakwụkwọ sinịọ sekọndịrị n’agụmagụ Igbo.

Mbunuche Nchọcha

Mbunuche nchọcha nke izugbe bụ ịchọpụta adịmire ngwa nkụzi kọmputa na mmeta nke ọma ụmụakwụkwọ sinịọ sekọndịrị n’agụmagụ Igbo. Nchọcha a lebakwaziri anya kpọmkwem n’ihe ndị a:

  1. ịchọpụta ụsa miin mmeta nke ọma ụmụakwụkwọ ndị e ji ngwa nkụzi kọmputa kụziere agụmagụ Igbo na ndị e jighi ngwa nkụzi kọmputa kụziere agụmagụ Igbo.
  2. ịchọpụta adịmire ngwa nkụzi kọmputa na mmeta nke ọma ụmụakwụkwọ ndị nwoke na ndị nwaanyị n’agụmagụ Igbo n’ụlọakwụkwọ sinịọ sekọndịrị na zonu mmụta Ishielu na steeti Ebonyi.
  3. ịchọpụta adịmire mpaghara ebe a rụnyere ụlọakwụkwọ na mmeta nke ọma ụmụakwụkwọ n’agụmagụ Igbo mgbe e ji ngwa nkụzi kọmputa kuziere ha agụmagụ Igbo.
  4. ịchọpụta maọbụ e jighi ezi ngwa nkụzi ziri ezi kụzie agụmagụ na-ebute emeghi nke ọma ụmụakwụkwọ ndị sinịọ sekọndịrị na zonu mmụta Ishielu na steeti Ebonyi.

Uru Nchọcha

Atụtụ mmụgharị, onye nchọcha mere na nchọcha a bara uru n’ihi na ọ kọwapụtara ka ya bụ atụtụ siri metụta nchọcha nke a na-eme ugbua. N’ime nchọcha ọbụla onye nchọcha na-eme, a na-enweriri uru maọbụ mpụtara ga-adị na ya. Na nchọcha nke a, onye nchọcha na-ele anya na ndị ga-aka rite uru na ya gụnyere:

  • Ụmụakwụkwọ sinịọ sekọndịrị na zonu mmụta Ishielu.
  • Ndị nkụzi ga-eritekwa uru.
  • Ndị hụrụ agụmagụ n’anya.
  • Ndị otu na-ahazi mmụta.
  • Ndị hụrụ mmụta n’anya.

Ụmụakwụkwọ sekọndịrị, ọkachasị ndị nke nọ na zonu mmụta Ishielu na steeti Ebonyi. Ha ga-erita uru na nchọcha a maka na nchọcha a ga-eme ka ha tinye uchu n’ebe agụmagụ Igbo dị. Nchọcha a ga-emekwa ka anya ha ruo n’ihe ndị ha adịghị na mbụ eleru anya. Nchọcha a ga-abara ha uru n’ihi na ọ ga-abawanye ọgụgụ isi ha ma mee ka ụbụrụ ha na-anụ nkọ n’ọrụ ha dị iche iche dịka o siri metụta agụmagụ Igbo nke gbadoro ụkwụ n’ekereuche.

Ndị nkụzi ọkachasị ndị nke na-akụziri ndị sinịọ sekọndịrị na zonụ mmụta Ishielu ga-eritekwa uru na nchọcha a. Nchọcha a ga-abara ha uru n’ihi na mgbe ọbụla ha ji ngwa nkụzi kọmputa akụzi agụmagụ Igbo, ọ ga-eme ka echiche ha na-abawanye. Ọ ga-emekwa ka ha mata ihe ndị ha amabughi banyere ngwa nkụzi kọmputa na nkụzi agụmagụ Igbo. Ha ga-esikwa na ya rite elele mbugo elu n’ụlọ ọrụ ha dị iche iche.

Ndị hụrụ agụmagụ Igbo n’anya ga-eritekwa uru maka na mgbe ọbụla ha hụrụ agụmagụ Igbo ka ụmụaka na-etolite etolite na-ezipụta ya ọkachasị ejije na egwu ọnwa Igbo ọdịnala, obi ga-abụ ha sọ aṅụrị.

Ndị mịnịstrị na ndị na-ahazi mmụta ga-erite uru na nchọcha a. Nke a ga-abịa ma ọ bụrụ na ndị akụziere agụmagụ Igbo agbasoo iwu na usoro e nyere ha mgbe ha na-emepụta ya n’emume. Ebumnobi ha ga-abịa na mmezu. Mmeta nke ọma ụmụakwụkwọ ndị a ga-ezipụtakwa ndị nhazi mmụta dị ka ndị maara ọrụ ha ma jiri ọrụ ha kpọrọ ihe ma bụrụ ndị bu mkpa obodo ha nakwa steeti ha n’obi.

Ndị hụrụ mmụta n’anya (nne na nna) ga-erite uru na nchọcha a. Mmụta bụ ihe dị ọkpụtọọrọkpụ. O si n’aka fere aka wee ruo anyị aka. Obi na-atọ ndị hụrụ mmụta n’anya ụtọ mgbe ọbụla ha hụrụ ụmụ ha ka ha na-eme ihe ahụ ha maara eme ọkachasị n’ihe gbasara agụmagụ Igbo.

Oke Nchọcha

Nchọcha a gbadoro ụkwụ na zonu mmụta Ishielu na steeti Ebonyi. Nchọcha a gbadokwara ụkwụ naanị n’adịmire ngwa nkụzi kọmputa na nkụzi na ọmụmụ agụmagụ Igbo. O lebakwara anya n’ihe ndị na-ebute ndaghachiazụ agụmagụ Igbo n’ebe ụmụakwụkwọ nọ. Nchọcha a lebakwaziri anya ma ebe a rụnyere ụlọakwụkwọ enwere ọnọdụ na mmeta nke ọma ụmụakwụkwọ n’agụmagụ Igbo ka ọ bụ na o nweghị. O lebakwara anya n’ọnọdụ jenda, ya bụ ọnọdụ abụm nwoke na abụm  nwaanyị na mmeta nke ọma n’agụmagụ Igbo. N’ikpeazụ, nchọcha a jedebere site n’ịchọpụta ma ọ bụ e jighị ezi ngwa nkụzi kụzie agụmagụ Igbo na-ebute ndaghachiazụ agụmagụ Igbo ka ọ bụ enweghị ezi mmasị ụmụakwụkwọ banyere nkụzi na ọmụmụ agụmagụ Igbo.

Ajụjụ Nchọcha

  1. Kedụ akara miin mmeta nke ọma ụmụakwụkwọ ndị e ji ngwa nkụzi kọmputa kụziere agụmagụ Igbo na ndị e jighị ngwa nkụzi kọmputa kụziere agụmagụ Igbo na zonu mmụta Ishielu na steeti Ebonyi?
  2. Kedụ ndịmiche dị n’etiti akara miin mmeta nke ọma ndị nwoke na nke ndị nwaanyị e ji kọmputa kụziri agụmagụ Igbo na zonu mmụta Ishielu na steeti Ebonyi?
  3. Kedụ ndịmiche dị n’etiti akara miin mmeta nke ọma ụmụakwụkwọ ndị nọ na mpaghara ebe mepere emepe na ndị nọ ebe emepeghị emepe e ji kọmputa kụziri agụmagụ Igbo na zonu mmụta Ishielu na steeti Ebonyi?
  4. Kedụ akara miin mmasị ụmụakwụkwọ ndị e ji ngwa nkụzi kọmputa kụziri agụmagụ Igbo na ndị e jighi ngwa nkụzi kọmputa kuziri?

Ụmaokwu Nchọcha

Ụmaokwu nchọcha onye nchọcha jiri mee nchọcha a na-egosipụta:

Ho­­1      E nweghị ezigbo ndịmiche pụtara ihe n’akara miin mmeta nke ọma ụmụakwụkwọ ndị e ji ngwa nkụzi kọmputa kụziere agụmagụ Igbo na ndị e jighi ngwa nkụzi kọmputa kụziere agụmagụ Igbo na zonu mmụta Ishielu na steeti Ebonyi.

Ho2      E nweghị ezigbo ndịmiche pụtara ihe dị n’etiti akara miin mmeta nke ọma ndị nwoke na nke ndị nwaanyị e ji kọmputa kụziere agụmagụ Igbo na zonu mmụta Ishielu na steeti Ebonyi.

Ho3      E nweghị ezigbo ndịmiche pụtara ihe dị n’etiti akara miin mmeta nke ọma na mpaghara ebe a rụnyere ụlọakwụkwọ na zonu mmụta Ishielu na steeti Ebonyi.

Ho4      E nweghị ezigbo ndịmiche pụtara ihe n’akara miin mmasị ụmụakwụkwọ ndị e ji ngwa nkụzi kọmputa kụziri agụmagụ Igbo na ndị e jighị ngwa kọmputa kụziri.

 

GET COMPLETE PROJECT