Sale!
Placeholder

ADỊMIRE NGWA NKỤZI NỤRỤLELE NA MMETA NKE ỌMA ỤMỤAKWỤKWỌ SINỊỌ SEKỌNDỊRI N’ ỌMỤMỤ AGHỌTAAZAA IGBO N’ OKPURU ỌCHỊCHỊ NSUKA NA STEETI ENUGWU

10,000 3,000

Topic Description

All listed  project topics on our website are complete work from chapter 1-5 in Typed format ( PDF/MS word format ) which are well supervised and approved by lecturers who are intellectual in their various fields of discipline, documented to assist you with complete, quality and well organized researched material. which should be use as reference or Guild line...  See frequently asked questions and answeres


ISI NKE MBỤ

MKPỌLITE

Ntọala Nchọcha

Asụsụ bụ nka malitere kemgbe okike ụwa ma bụrụkwa nke mmadụ na ibe ya ji enwe mmekọrịta, ekwukọrịta, azụrịta ahịa, akparịta ụka maọbụ ama ihe na-aga n’ ọbi maọbụ echiche mmadụ. Iwuala (2013) kọwara asụsụ dịka otu njirimara nke kewara mmadụ na ụmụ anụmanụ ndị ọzọ, ọ bụladị anụmanụ ndị ahụ na-akpa agwa dịka mmadụ. Ọ gara n’ ihu kọwaa na asụsụ bụ ụgbọ na-ebu omenala mmadụ, n’ ihi na ọ bụ otu ụzọ mmadụ si enyefe omenala ha site n’aka ndị okenye na ndị ọzọ na-asụ asụsụ ahụ gafee n’ aka ụmụaka na ndụdụgandụ na-abịa n’ihu. Asụsụ dịka Onwuka (2014) siri gosipụta dị ka mmadụ maka na ọ na-eto eto bụrụkwa ihe na-anwụ anwụ. Ọ bụrụ na ndị na-asụ asụsụ jiri asụsụ ha kpọrọ ihe, na-asụ ya maọbụ na-amụ ihe banyere ya mgbe niile n’ ụlọakwụkwọ dị iche iche, ọ ga-eto etu O kwesiri. N’ aka nke ọzọ, Ọ bụrụ na ndị na-asụ asụsụ ewere asụsụ ha dịka ihe adịghị mkpa hapụ ịsụ ya mgbe niile, oge ga-eru mgbe asụsụ ha ahụ ha na-eleda anya ga-anwụ dịka mmadụ si anwụ.

Asụsụ dị oke mkpa ma baa uru na ndụ mmadụ. Ọ bụ nke a mere ndị Atụmatụ Agumakwụkwo gọọmenti etiti Naịjirịa jiri kọwapụta nke ọma n’ akwụkwọ “National Policy on Education” FRN (2004), na nwatakịrị ọbụla ga-amụrịrị otu  n’ ime asụsụ ọdịnala Naịjirị n’ ụlọakwụkwọ malite n’ ụlọakwụkwọ ọtaakara iji chekwa asụsụ ahụ. Ọkpụrụkpụ asụsụ atọ ala Naịjirịa bụ Igbo, Awụsa na Yoruba.

Asụsụ Igbo bụ nke doro anya nke ọma na o nweela ọnọdụ n’ ebe mmụta dị “National  Policy on Education” FRN (2004) tinyere otu  asụsụ ọdịnala Naịjirịa ka ọ bụrụ ihe ọmụmụ nwata akwụkwọ ọbụla nọ na sinịọ sekọndịrị ga-eme. Ndị Igbo bụ agbụrụ bi n’ ọnwụwa anyanw Naịjirịa (Umo na Ezema 2007). Asụsụ Igbo bụ ihe e ji ama onye bụ onye Igbo kpọmkwem iji kụziere ụmụaka ihe bụ omenala Igbo nakwa mpaghara ọmụmụ asụsụ Igbo ndị ọzọ. N’ ihi nke a ka ndị Igbo ga-eji mụọ ka e si asụ, ede, na ka e si agụ asụsụ Igbo nke ọma na-amaghị jijiji maọbụ tụọ egwu ọbụla, iji me ka asụsụ Igbo ghara ịnwụ n’ oge odịniihu. Nchọcha ndị (United Nation Organization for Education Science and Culture (UNESCO) mere nsonso a na-egosi na asụsụ Igbo nwere ike ịnwụ n’ oge eteghi aka (Umo na Ezema, 2007). Ọ na-adị ọtụtụ mmadụ ka ihe dị etu a enweghị ike ime, mana ihe nchọcha ụfọdụ ụmụ Igbo hụrụ asụsụ na omenala Igbo n’ anya na-egosi na nke a dị nso  ma ọ bụrụ na ndị Igbo enweghị mgbanwe aka ọkụ n’ ihe gbasara asụsụ na omenala ha (Ejiofor 2006). Ya mere, ndị Igbo niile kwesiri ileba anya n’ ihe banyere nkwalite asụsụ Igbo na-atụfughị oge iji mee ka asụsụ Igbo ghara ịnwụ. N’ iji kwado nkụzi na ọmụmụ asụsụ Igbo n’ ụlọakwụkwọ ka gọvụmenti etiti Naịjirị jiri kewapụta nke ọma oge a ga-eji asụsụ ebe a mụrụ nwatakịrị were malite ịkụzịrị ya ihe bido n’ ụlọakwụkwụ nke mbụ na paịmarị wee rue na nke atọ (FRN, 2004). N’ ihi ya ka o jiri dị mkpa na nwaafọ Igbo ọ bụla kwesịrị ịma ka e si asụ, ede ma na asụkwa asụsụ Igbo.

Aghọtaazaa bụ otu  n’ime mpaghara ọmụmụ asụsụ Igbo ma bụrụkwa otu  n’ ime ọkpụrụkpụ ihe ndị na-apụtara ụmụakwụkwọ n’ ule kwa mgbe. Ofomata (2007), kọwara aghọtaazaa dịka agụmagụ ọ na-abụ a gụchaa, a zaa ajụjụ ndị na-esota ya. Ajụjụ ndị ahụ a ga –ajụ bụ site n’ agumagụ ahụ e depụtara, ka a ga-esi jụọ ya. Anozie (2001) n’ echiche nke ya kpọrọ aghọtaazaa “ agụọ azaa”. Ebe Ọmachọnụ (2008) kọwara aghọtaazaa dịka mmadụ inwe ike gụọ ma ghọtakwa ozi maọbụ echiche di n’ ederede onye ahụ gụrụ. Nkọwa nke a pụtara mmadụ ịghọta n’ ozuzu oke ederede agọtaazaa ọ gụrụ. aghọtaazaa bụ agụmagụ chọrọ ileru anya ala, iji uche agụ na ịgba mbọ ghọta nke ọma ihe dị n’ime agụmagụ ahụ. N’ihi na mgbe ụfọdụ a na-eji okwu nka dị iche iche achọ aghọtaazaa mma, ka o wee gharakwa ịdịrị nwata akwụkwọ oke mfe ịza ajụjụ ndị na-esota ya.

Okwu nka bụ okwu ndị Igbo ji akọwa onwe ha  ma ha na-asụ asụsụ ha. Ha na-eji okwu nka achọ asụsụ maọbụ okwu ha mma (Ofomata, 2007). Asụsụ Igbo bụ asụsụ okwu nka jupụtara n’ime ya. N’ihi nke a mmụta okwu nka ga-eme ka ederede aghọtaazaa ọbụla e nyere ụmụakwụkwọ n’ule dịrị ha mfe. E nwere ọtụtụ okwu nka dị iche iche n’ asụsụ Igbo dịka ilu, akpaalaokwu, ụkabụilu dgz.

N’ala Naịjirịa, a na-akụzi aghọtaazaa n’ asụsụ Igbo iji kwado ụmụakwụkwọ maka ule nzere “Senịọr Secondary School Certificate Examination (SSSCE). Iji kwado nke a, onye is ule WAEC (2008-2010) kọwara na tupu ndị ga-ele ule ha n’ ogo siniọ sekọndịrị edebanye aha ha, onye ahụ ga-etinyerịrị asụsụ Bekee, tinyekwara idebanye otu  n’ ime asụsụ ọdịnala Naịjirịa dịka Awụsa, Igbo maọbụ Yoruba (Iwuala, 2013). Nke a na-egosi na onye ọbụla tinyere asụsụ Igbo n’ ule ndị a ga-emerịrị aghọtaazaa. N’ ihi ya ka ọ ji dị mkpa ka a na-akụzi aghọtaazaa n’ ụlọakwụkwọ Sinịọ Sekọndịrị nke ọma ka o wee doo onye na-amaghị ya anya. Ọ bụ eziokwu na asụsụ Igbo so n’ asụsụ atọ  ndị ahụ a na-akụzi n’ ụloakwụkwọ na Naịjirịa mana ọtụtụ ihe nwere ike  na-egbochi nkụzi na ọmụmụ ya n’ ụlọakwụkwọ. Ihe  ndị a gụnyere: Usoro nkụzi e ji akụziri ụmụakwụkwọ asụsụ Igbo maọbụ ejighị ezigbo ngwa nkụzi, ọnọdụ abụ m nwoke maọbụ nwaanyi (jenda) na mpaghara ebe a rụnyere ụlọakwụkwọ. N’ ịga n’ ihu, ozi sitere n’aka onye isi ule WAEC (2008, 2009, 2012 na 2013) kọwara na ụmụaka na-amụ asụsụ Igbo anaghị eme nke ọma n’ ule SSCE, ọ kachasi na mpaghara aghọtaazaa. Ha na-egosi na  ihe ndị nwere ike ibute emeghị nke ọma ụmụakwụkwọ n’ ule a gụnyerre ihe ndị a akpọrọla aha n’elu tinyekwara na ụfọdụ ụmụakwụkwọ na-ewere nkụzi na ọmụmụ asụsụ Igbo dịka ihe na-atụ ụra maọbụ were ya dịka ihe ọmụmụ e ji emezu ọnụọgụgụ ihe ọmụmụ ndị ọzọ. Ụfọdụ ha were  na o nweghị ebe e ji asụsụ Igbo aga, na asụsụ Bekee bụ ebe a nọ. Ọ bụ omume ọjọọ ndị ụmụafọ Igbo na-emeso asụsụ Igbo mere ka mbọ gọọmenti ala Naịjịra na-agba iji hụ na a na -amụ asụsụ Igbo n’ ụlọakwụkwọ nke bụ ihe ga-enye aka ịkwalite ọmụmụ aghọtaazaa n’ asụsụ Igbo, site n’aka ngalaba ụlọ ọrụ ya na-ahụ maka mmụta nakwa n’aka ụlọ ọrụ nkwalite ọmụmụ na nchọcha (NERDC) bụrụ ihe amitaghị ezigbo mkpụrụ. Nke a mere na aghọtaazaa n’ asụsụ Igbo ka ji bụrụ ihe anaghị aga n’ ihu etu o kwesiri ma bụrụkwa ihe ụmụakwụkwọ anaghị emeta nke ọma dịka o kwesiri n’ ule. Ọtụtụ ihe bụ ihe ndị nwere ike ibute ndaghachi azụ ụmụakwụkwọ n’ aghọtaazaa Igbo n’ ule Siniọ sekọndịrị ha iji nweta  nzere SSSCE. Otu  n’ ime ihe ndịa nwere ike bụrụ n’ ihi ejighị ezigbo ngwa nkụzi kụzie ya bụ ihe ọmụmụ n’ ụlọakwụkwọ.

E nyela ọtụtụ nkọwa banyere ngwa nkụzi. Ngwa nkụzi bụ ụmụ ihe ndị ahụ onye nkụzi na-ewebata na nkụzi iji nyere ya aka ime ka ụmụaka ghọta ihe ọ na-akụzi (Nwadike, 1993). Iji kwado nke a Cayne (1993) n’ echiche ya kọwara ngwa nkụzi dịka ihe na-enye aka nke mmadụ nwere ike ịdabe wee weta ihe ọ chọrọ. Nke a pụtara na ngwa nkụzi bụ ihe mmadụ nwere ike ịtụkwasị aka wee kwalite nkụzi na ọmụmụ. N’ ịga n’ ihu, ngwa nkụzi na-eme ka onye nkụzi ghara ime oke nkọwa dịka ọ dị n’ usoro nkụzi nke ọdịnala (Conventional method). Usoro nkụzi nke ọdịnala bụ usoro nkụzi onye nkụzi naanị ya na-ekwu maọbụ na-eme nkọwa maka isiokwu ahụ maọbụ dee ihe n’ Ụgbọodee site n’ iji ọtu ọmụmaatụ zipụta echiche nkụzi ahụ  (Ntiajuokwu, 2010). Ọ gara n’ ihu kọwaa na  nchọcha emerela gosiri na usoro nkụzi nke ọdịnala nwere mperi dị iche iche nke otu  n’ ime ya bụ na ọ na-agbado ụkwụ n’ ebe onye nkụzi nọ karịa n’ ebe ụmụakwụkwọ nọ. Ọzọ, a na-ahụtakwazi usoro nkụzi ọdịnala dịka usoro nkụzi agba ochie  maọbụ usoro nkụzi tagoro nchara ọ kachasi n’ oge igwe kọmpụta  maọbụ oge sayensi na teknụụzụ  a nọ na ya ugbu a.

Ngwa nkụzi ndị e nwere ike iji kụzie asụsụ Igbo maọbụ aghọtaazaa n’ asụsụ Igbo gụnyere: redio, akwụkwọ ọgụgụ, chaati, eserese, kaadị okwu, kaseti, onyoonyo televishọn  mgbọodee, ụlọ omenala, ụlọ ngwa asụsụ, maapụ mpaghara  ndị na-asụ asụsụ Igbo,  arịa dị iche iche dịka iyeri ntị, mgbaaka, akupe, ute, mkpọrọ, ấkầ, ijigida, nzu dị iche iche, ọkpụkpụ, ọdụ enyi, na ọtanjere (Ugbor, 2012). Ngwa nkụzi niile ndị a dị mkpa n’ ihi na ha na-eme ka nghọta dị mfe ma mịtakwa ezi mkpụrụ, Ngwa nkụzi na-akpali akụkụ ahụ mmadụ dịka nke e ji anụ ihe, ahụ ihe maọbụ na-ebitukwa ihe aka. Ọ na-akwalite nkụzi na ọmụmụ ka e wee weta ihe dị iche n’ omume ụmụakwụkwọ ma nwe nkụzi na ọmụmụ dị mma bakwara uru. Onye ọrụ ọbụla nwere ngwa ọrụ ya.

Ọmụmaatụ: Onye ọrụ ubi nwere mma, ọgụ, ngwu, abọ, mgbazu na ihe ndị ọzọ o ji arụ ọrụ ya were were. E wepụ ihe ndị a, ọ gaghị arụ ọrụ ya nke ọma (Nwadike, 1993). Ma dịka o si gbasata nchọcha a, ngwa nkụzi nụrụlere ka onye nchọcha ga-eji mee nchọcha a. Iji ngwa nkụzi nụrụlere na nkụzi na ọmụmụ aghọtaazaa ka onye nchọcha na-ele anya na ọ ga-enyere ụmụakwụkwọ aka ịgbanarị nsogbu emeghị nke ọma n’ ule aghọtaazaa.

Ngwa nkụzi nụrụlere bụ ngwa nkụzi gbasatara iji Igwe nụru na nke lere na nkụzi na ọmụmụ. Ebe nụrụ pụtara mmadụ ịnụ ihe ma lere pụtara mmadụ ihụ ihe, ngwa nkụzi nụrụlere bụ ngwa nkụzi e jikọrọ ọnụ imetụta ọgan anya maka ịhụ ihe na ọgan ntị maka ịnụ ihe iji kwalite nkụzi na ọmụmụ. Nwoji (2002), kọwara ngwa nkụzi nụrụlere dịka nke na –akpali akụkụ ọnụnụ na ọhụhụ mmadụ n’ otu  n’ otu. Nke a pụtara na ngwa nkụzi nụrụlere bụ akụkụ teknụụzụ edukeshọn nke na-enye aka inweta adimire na mpụtara nkụzi na ọmụmụ. N’ echiche nke Saibu (2011), ọ kọwara na ngwa nkụzi nụrụlere bụ ngwa nkụzi a na-eji ihe onyoonyo televishọn na nke “digital video  disc” (DVD) egosipụta. Ọ gara n’ ihu kọwaa na ngwa nkụzi nụrụlere nwere ihe na-enyere ya aka ịweghachite ihe e tinyere n’ ime ya iji mee ka nkụzi na ọmụmụ dị ire ma kwalitekwa mmụta n’ime ụmụakwụkwọ. N’ otu  aka ahụ ngwa nkụzi nụrụlere chọrọ ọkụ elatrik iji wee rụọ ọrụ. Uru ngwa nkụzi nụrụlere na nkụzi na ọmụmụ bara ụba. Nke mbụ ọ na-ebelata oge onye nkụzi ji akọwa isiokwu ihe ọmụmụ ya iji mee ka ụmụakwụkwo ghọta ya nke ọma. Ọzọ, ngwa nkụzi nụrụlere e jikọrọ ọnụ nke ọma na-akwalite mmeta nke ọma ụmụakwụkwọ n’ ihe ọmụmụ ahụ. Osokoya (2007) kwadoro nke a mgbe O kwuru na a chọpụtala adimire ngwa nkụzi nụrụlere na nkụzi n’ ihi na ọ na-enye ụmụaka mmụta tọrọ atọ ma bụrụkwa nke ha agaghị echefu ngwa ngwa. Saibu (2002) n’ echiche nke ya kọwara na ngwa nkụzi nụrụlere na-enyere onye nkụzi aka ikụzi ihe nke ọma site n’ ikpali mmụọ ụmụakwụkwọ n’ ebe ihe ọmụmụ ha na-eche na ọ na-atụ ụra ma ọ dị mkpa.

Ogo ihe nkiri onyoonyo televishọn na DVD n’ ezinaụlọ dị iche iche bụ okwu akpụ n’ ọnụ ugbu a ma chọkwa enyemaka (Ugbor, 2012). Ugbor gara n’ ihu kọwaa na ọnọdụ a bụ nke nne na nna, ụmụntorobịa nọ n’ ogo agumakwụkwọ na-achuso karịa ịchụso ihe nkiri ndị ahụ gbadoro ụkwụ n’ agụmakwụkwọ ha. Ụmụakwụkwọ ndị a ka ndị nne na nna na- ahapụ itufu ọtụtụ awa n’ ebe ha na-ekiri ihe nkiri ụlọ ndị a. Ibrahim (2009) kọwara  na ngwa nkụzi nụrụlere na-eme ka nghọta n’ uche ụmụaka di n’ ihe a na-akụziri ha na klaasi. N’ ihi nke a ka onye nchọcha ji chọọ ichọpụta etu ihe nkiri televishọn na DVD ndị a ga esi baa uru n’ ọnọdụ ihe ọmụmụ na klaasi n’ ebe ọ gbasara aghọtaazaa n’ asụsụ Igbo.

Na mgbakwunye, ihe ọzọ onye nchọcha na-eche nwere ike imetụta mmeta nke ọma ụmụakwụkwọ n’ ule aghọtaazaa Igbo bụ ọnọdụ abụm nwoke maọbụ nwaanyị. Ọnọdụ abụm nwoke maọbụ nwaanyị bụ ihe nrụrịtaụka ma mmeta nke ọma ụmụakwụkwọ o sitere na jenda ha dịka o si gbasata asụsụ. Ụmụnwoke na ụmụnwaanyị dị mkpa n’ ọmụmụ asụsụ tụmadị n’ asụsụ Igbo. Nke a bụ ọkpụrụkpụ ihe a mara ama na o nwere ọrụ ọ na-arụ n’ ebe mmụta dị. Site n’ etu Uzoegwu (2004) si wee kọwapụta ihe ndị  United Nations International Children’s Emergency Fund (UNICEF) kọwara, na jenda bụ ihe obodo kwekọrịtara ọnụ e ji mara nwoke maọbụ nwaanyị. Nke a gbadoro ụkwụ n’ ụdị omume, mmekọrịta na omenaala dị n’ obodo. Ihe nke a na-egosi bụ n’ omume na ọrụ nwoke maọbụ nwaanyị ga-adabe na nkwenye ndị obodo. N’ iji kwado nke a ka Kilosmier (2006) kọwara n’ ọrụ ọbụla nke nwoke na nwaanyị na-arụ, na a na-ekwetakarị na nwoke ka nwaanyị arụ ọrụ ahụ. Ọzọ, Ugbor (2012) kọwara na Wale (1999)  mere ezigbo nchọpụta na-egosi na ụmụnwaanyị na-enwe mmasị n’ asụsụ maọbụ ọmụmụ asụsụ karịa ụmụnwoke. Ọ gakwara n’ ihu kọwaa n’ ọtụtụ ụmụnwaanyị kwetara na ha ka ụmụnwoke asụ asụsụ dị iche iche. Onye nchọcha wee na-achọ ịmata ma okwu a ọ dị ire na nchọcha a.

E wezuga  jenda, mpaghara ebe a rụnyere ụlọakwụkwọ bụ otu  n’ ime ihe ndị a chọpụtara na-emetụta mmeta nke ọma ụmụakwụkwọ (Eneh, 2012). Ebe a rụnyere ụlọakwụkwọ dị mkpa nke ukwu ma nwekwa ọrụ ọ na-arụ n’ebe  nkụzi na ọmụmụ ihe dị.  E nwere ụlọakwụkwọ sekọndịrị ndị dị n’ obodo mepere emepe na ndị dị n’ ime obodo. Umo (2004) n’ echiche nke ya kọwara n’ ebe ụlọakwụkwọ dị na-egosi ụdịrị ndị nkụzi nọ  na ya, tinyekwara ka ebe a na-enwe nkụzi na  ọmụmụ dị. Nke a mere onye nchọcha ji chọọ ileba anya ma okwu a ọ dị ire na nkụzi na ọmụmụ aghọtaazaa n’ ụlọakwụkwọ sinịọ sekọndịrị dị n’ okpuru ọchịchi Nsuka.                   Site n’ihe ndị a a kọwara, ọ bụ ihe doro anya n’ ụdị ngwa nkụzị onye nkụzi ji kụzie ihe na-enye aka ikwalite nkụzi na ọmụmụ maọbụ mmụọ ụmụakwụkwọ na mmeta nke ọma ha n’ ihe a na -akụzi. Aghọtaazaa bụ otu  n’ ime mpaghara ihe ọmụmụ asụsụ Igbo a tụrụ anya na nwata akwụkwọ

ọbụla ga-amụta n’ ụlọakwụkwọ. Otu  ụzọ a ga-esi mee ka nke a dị ire maọbụ mita ezi mkpụrụ bụ site n’ iji ngwa nkụzi nụrụlere kụzie aghọtaazaa n’ ụlọakwụkwọ. Mbunuuche ngwa nkụzi nụrụlere bụ ime ka ụmụakwụkwọ jiri anya ha hụ ma were ntị ha nụ ihe onye nkụzi na-akụzi iji mee ka nkụzi na ọmụmụ dị mfe. Ọ bụ nke a mere onye nchọcha ji eleba anya n’ adimire ngwa nkụzi nụrụlere na mmeta nke ọma ụmụakwụkwọ sinịọ sekọndịrị n’ aghọtaazaa.

Nsogbu Nchọcha

Nkụzi asụsụ Igbo kemgbe e mere ka o bụrụ ihe a ga na-akụzi n’ ụlọakwụkwọ ka na-aga n’ ihu na-enwe nsogbu dị iche iche maọbụ ịla azụ nke na-egbochi mmeta nke ọma ụmụakwụkwọ n’ ihe ọmụmụ  asụsụ Igbo. Aghọtaazaa bụ otu  n’ ime mpaghara ihe ọmụmụ e nwere n’ asụsụ Igbo a na-amụ n’ ụlọakwụkwọ sinịọ sekọndịrị. Mana ọ ka bụ ihe ụmụakwụkwọ anaghị emeta nke ọma na ya etu o kwesịrị n’ ule dịka onyeisi ule WAEC (2013) kọwara. Ọnọdụ dị etu a wee bụru nke na-adịghị mma, na ekwesighị ịdị n’ ebe ụmụafọ Igbo nọ.

Eleghị  anya ọnọdụ dị otua nwere ike bụrụ ihe sitere n’ aka ụmụakwụkwọ ndị a n’ onwe ha dịka onye isi ule WAEC (2013) siri kọwa. Onye isi ule a kọwara na e metaghị nke ọma ụmụakwụkwọ n’ ule aghọtaazaa nwere ike bụru n’ihi e jighị asụsụ Igbo kpọrọ ihe. Ọ gakwara n’ ihu kwuo n’ ụfọdụ ụmụakwụkwọ anaghị etinye uche n’ ihe ọmụmụ aghọtaazaa asụsụ Igbo.

N’ihi nke a ha na-aza ajụjụ na-esote ederede aghọtaazaa na-aghọtaghị nke ọma ederede ahụ. Ụfọdụ ụmụakwụkwọ na-ewekwara nkụzi na ọmụmụ aghọtaazaa dịka ihe na-atụ ụra. N’ iji gbakwunyere okwu a, onye nchọcha na-eche na ihe ọzọ nwere ike bụru ejighị ezigbo usoro na ngwa nkụzi dabara kụzie ihe na klaasi. Ngwa  nkụzi bụ nke a kọwara dịka ụmụ ihe ihe ndị ahụ onye nkụzi na-ewebata na nkụzi iji nyere ya aka ime ka ụmụaka ghọta ihe ọ na-akụzi.

Atụerela adimire ngwa nkụzi nụrụlere n’ ihe ọmụmụ ndị ọzọ dịka “History” ma adimire ya bụ ihe atụlebeghị n’ aghọtaazaa. Ọ bụ ya mere onye nchọcha ji wee chọọ ịchọpụta admire ngwa nkụzi nụrụlere na mmeta nke ọma ụmụakwụkwọ sinịo sekọndịrị n’ ule aghọtaazaa.

Mbunuche Nchọcha

Mbunuche nchọcha nke izugbe bụ ịchọpụta adịmire ngwa nkụzi nụrụlere na mmeta nke ọma ụmụakwụkwọ sinịọ sekọndịrị n’ ule aghọtaazaa. Nchọcha ga-elebakwa anya kpọmkwem  n’ ihe ndị a:

  1. Ịchọpụta ụsa miin ụmụakwụkwọ ndị e ji ngwa nkụzi nụrụlere kuziere aghọtaazaa na ndị a na-ejighị ngwa nkụzi nụrụlere kuziere aghọtaazaa.
  2. Ịchọpụta ndịiche dị n’ etiti miin ụmụakwụkwọ ndị nwoke na ndị nwaanyị na mmeta nke ọma ha n’ aghọtaazaa mgbe e ji ngwa nkụzi nụrụlere kuziere ha ihe.
  3. Ịchọpụta adịmire mpaghara ebe a rụnyere ụlọakwụkwọ na mmeta nke ọma ụmụakwụkwụ n’ ule aghọtaazaaa mgbe e ji ngwa nkụzi nụrụlere kuziere ha aghọtaazaa.
  4. Ịmata mmekọrịta adịmire ngwa nkụzi nụrụlere na jenda (ọnọdụ abum nwoke maọbụ nwaanyị) ụmụakwụkwọ na mmeta nke ọma n’ ule aghọtaazaa.
  5. Ịmata mmekọrịta adịmire ngwa nkụzi nụrụlere na mpaghara ebe a rụnyere ụlọakwụkwọ na mmeta nke ọma ụmụakwụkwọ n’ ule aghọtaazaa.

Uru Nchọcha

Nchọcha a ga-aba uru n’ ụzọ dị iche iche. Ndị nchọcha a ga-abara uru gụnyere: ụmụakwụkwọ, ndị nkụzi, ndị nne na nna ụmụakwụkwọ,ndị ọbịa na-amụ asụsụ Igbo, ndị isi ụlọakwụkwọ, ndị nhazi kụrịkụlụm,  ndị gọvụmenti na ọha na eze ndị Igbo niile.

Nchọcha a ga-eme ka a mata uru atụtụ ụbụrụ na atụtụ mmụta bara n’ihe banyere ọmụmụ aghọtaazaa n’ asụsụ Igbo. Nke a bụ n’ihi na onye nchọcha webatara atụtụ ụbụrụ na atụtụ mmụta iji gosi n’ụbụrụ nwata ọbụla nwere Ngwa Mmụta Asụsụ (NMA) iji mụta asụsụ ma matakwa uru atụtụ mmekọrịta mmadụ na ibe ya bara n’ ọmụmụ aghọtaazaa asụsụ Igbo.

Ụmụakwụkwọ ga-erita uru na nchọcha a, ọ kachasi ndị na-agụ na klassi nke abụọ na sinịọ sekọndịrị iji mee nke ọma n’ ule nzere SSSCE ha. N’ ihi na ọ ga-enyere ha aka ịmata ka e si agụ ma na-azakwa ajụjụ so ederede aghọtaazaa Igbo. N’ ịga n’ ihu, ọ ga-enyekwara ụmụakwụkwọ  aka ịkpalite mmụọ ha n’ ihe ọmụmụ aghọtaazaa na ịmata na mgbe mmadụ na-agụ ederede aghọtaazaa, na ọ ga na- akpọpụta okwu ndị ahụ e jiri dee edemede ahụ nke ọma, mụtakwa nsupe okwu ndị ahụ ma were ha mee ahịrịokwu dị mma. Nchọcha a ga-emekwa ka ụmụakwụkwọ mata na asụsụ Igbo bụ njirimara ndị Igbo, bụrụkwa isi sekpụ ntị n’ ọmụmụ aghọtaazaa.

Ọzọkwa, nchọcha a ga-abara ndị nkụzi uru maka na ọ ga-enyere ha aka ịhụ na e ji ngwa nkụzi dịka nụrụlere were na-akụziri ụmụaka ihe iji mata ihe ndị ahụ kwesịrị ka a kụziere ụmụaka gbasara aghọtaazaa n’ ụzọ ha ga-esi ghọta ihe a kuziri nke ọma, uru na nkụzi ihe ọmụmụ aghọtaazaa n’ asụsụ Igbo.

Site na nchọcha a, a tụrụ anya na ndị nne na nna ụmụakwụkwọ ga-agbanwe omume ọjọọ ha na-emeso asụsụ Igbo. Nke a ga-adị ire site n’ ịchịkọba ọgbakọ nkụzi ndị nne na nna n’ obodo. Ha ga-amata mkpa ọ dị ịsụrụ ụmụ ha asụsụ Igbo n’ ụlọ ha dị iche iche ma nyekwara ha aka ịmata na ọ bụ oke na ọrụ dịịri ha ibido na nwata zụlite ụmụ ha n’ asụsụ Igbo karịa asụsụ Bekee iji kwalite agumakwụkwọ ụmụ ha.

Ndị ọbịa na-amụ asụsụ Igbo ga-eritekwa uru nchọcha a site n’ ịmụta ka e si agụ ederede aghọtaazaa Igbo nakwa ịmata uru atụtụ nchọcha nke Chomsky na Skinner bara na mmụta asụsụ. Atụtụ nchọcha nke Chomsky na-akọwa mkpa  izulite Ngwa Mmụta Asụsụ (NMA) bụ nke a kpọrọ “Language Acquisition Device (LAD)” na Beeke bara. Ọ bụ ngwa mmụta asụsụ a ga-eme ka nwata maọbụ onye na-amụ asụsụ na-esonye n’ ihe ọmụmụ asụsụ ahụ. Atụtụ nchọcha nke Skinner n’ aka nke ya na-akọwa na ọmụmụ asụsụ dabere n’ ińọmi gburugburu ebe a mụru nwatakiri maọbụ ndị okenye iji kwalite ọgụgụ isi ya. Nke a  bụ maka na onye nchọcha webatara atụtụ ndị a iji gosi na ọ na adị mfe ụmụakwụkwọ iňọmị asụsụ ndị ha na ha nọ na gburugburu oge ọ bụla. N’ ihi nke a onye ọbịa na-amụ asụsụ ga-eńomi onye nkụzi asụsụ Igbo ahụ ọ na-amụ, otu  ọgbọ na ndị ọzọ nọ na gburugburu asụsụ Igbo ahụ.

Nchọcha a ga-abakawara ndị isi ụlọakwụwọ na ndị gọvụmenti uru site n’ ịchọpụta mkpa inwe ezigbo ngwa nkụzi dịka nụrụlere dị n’ ụlọakwụkwọ sekọndịrị iji kwalite nkụzi n’ ọmụmụ aghọtaazaa n’ asụsụ Igbo.

Ndị nhazi kụrịkụlụm ga-erita uru nchọcha a site n’ ileba anya n’ ebe ndị ahụ na-enye ndị nkụzi na ụmụakwụkwọ nsogbu n’ ihe ọmụmụ aghọtaazaa. Ọzọ, ọ ga-enyere ha aka iwebata ngwa nkụzi dịka nụrụlere mgbe ha na-achọ ituleghari maọbụ mezigharia kụrịkụlụm iji mee ka mbunuuche nkụzi aghọtaazaa bụrụ ihe e mezuru.

N’ ikpe azụ, ọha na eze ndị Igbo niile ga- amata na asụsụ Igbo bụ ihe e ji mara ndị Igbo ma bụrụkwa otu  ihe dị mkpa ndị nna  nna ha hapụrụ ha nke kwesịrị ka e chekwaa nke ọma.

Oke Nchọcha

Nchọcha a ga-ejedebe n’ụlọakwụkwọ sinịọ sekọnddịrị nke abụọ dị n’ okpuru ọchịchị Nsụka na Steeti Enugu. Ọ ga-eleba anya n’ inyocha adịmire ngwa nkụzi nụrụlere na mmeta nke ọma ụmụakwụkwọ n’ ule aghọtaazaa. N’ ikpe azụ, ọ ga-elebakwazi anya n’ihe ndị ọzọ dịka etu ọnọdụ abụm nwoke maọbụ nwanyi na mpaghara ebe a rụnyere ụlọakwụkwọ  si emetụta ụmụakwụkwọ sinịọ sekọndịrị na mmeta nke ọma ha n’ule aghọtaazaa n’ asụsụ Igbo.

Ajụjụ Nchọcha

Iji duzie nchọcha a, onye nchọcha hibere ajụjụ nchọcha ndị a:

  1. Kedụ akara miin agbammbọ ụmụakwụkwọ ndị e ji ngwa nkụzi nụrụlere kụziere aghọtaazaa na nke ndị a na-ejighị na mmeta nke ọma ha n’ ule aghọtaazaa?
  2. Kedụ ndịịche dị n’ etiti akara miin agbammbọ ụmụakwụkwọ ndị nwoke na ndị nwaanyị na mmeta nke ọma ha n’ ule aghọtaazaa mgbe e ji ngwa nkụzi nụrụlere kụziere ha aghọtaazaa?
  3. Kedụ adimire mpaghara ebe a rụnyere ụlọakwụkwọ n’ akara miin agbambọ ụmụakwụkwọ na mmeta nke ọma ha n’ ule aghọtaazaa mgbe e ji ngwa nkụzi nụrụlere kuziere ha ihe?
  4. Kedụ mmekọrịta akara miin agbammbọ ụmụakwụkwọ ndị e ji ngwa nkụzi nụrụlere kụziere ihe na ọnọdụ abụm nwoke maọbụ nwaanyị ụmụakwụkwọ na mmeta nke ọma ha n’ ule aghọtaazaa?
  5. Kedụ mmekọrịta akara miin agbammbọ ụmụakwụkwọ ndị e ji ngwa nkụzi nụrụlere kụziere aghọtaazaa na mpaghara ebe a rụnyere ụlọakwụkwọ na mmeta nke ọma ha n’ ule aghọtaazaa?

Ụmaokwu

Onye nchọcha ga-anwale ụmaokwu nchọcha ndị a n’ ogo akara mpụtara ndịịche bụ 0.05.

Ho1 E nweghị ezigbo ndịmiche  pụtara ihe dị n’ akara miin agbammbọ  ụmụakwụkwọ ndị e ji ngwa nkụzi nụrụlere kụziere aghọtaazaa na ndị a na-ejighị kụziere.

Ho2  E nweghị ezigbo ndịmiche pụtara ihe n’ akara miin agammbọ ụmụakwụkwọ ndị nwoke maọbụ ndị nwaanyị na mmeta nke ọma ha n’ ule aghọtaazaa mgbe e ji ngwa nkụzi nụrụlere kụziere ha ihe.

Ho3   E nweghị ezigbo ndịmiche pụtara ihe n’akara miin agbammbọ ụmụakwụkwọ ndị nọ n’ obodo mepere emepe na ndị nọ n’ ime obodo n’ ule aghọtaazaa ha mgbe e ji ngwa nkụzi nụrụlere kụziere ha ihe.

Ho4 E nweghị ezigbo mmekọrịta pụtara ihe n’ akara miin agbammbọ ụmụakwụkwọ ndị e ji ngwa nkụzi nụrụlere kuziere aghọtaazaa na ọnọdụ abụm nwoke maọbụ nwaanyị ụmụakwụkwọ na mmeta nke ọma n’ ule aghọtaazaa.

Ho5  E nweghị ezigbo mmekọrịta pụtara ihe n’ akara miin agbammbọ ụmụakwụkwọ ndị e ji ngwa nkụzi nụrụlere kụziere aghọtaazaa na mpaghara ebe a  rụnyere ụlọakwụkwọ na mmeta nke ọma ha n’ ule aghọtaazaa.

GET COMPLETE PROJECT